Wetanu Onyinye di mma k’anyi nye Okaka, N’ihi na Chineke Nna bu Ya ka’genye onyinye dim ma, N’ihi na Chineke Nna bu Ya ka’genye onyinye nile; O bu Odogwu, Chineke Nna nara nu onyinye anyi o! Chineke Nna Okaka Ibu Odogwu!
(Alto, tenor and Bass) Wetanu Onyinye dim ma, ka’nyi nye Dinwenu Wetanu onyinye di mma ka’nyi nye Okaka, Chukwu Odogwu, Okaka Imeka, Chukwu Odogwu (continue 4 times)
VERSES:
1. Obu Chineke kere mmadu, kee ihe nile
Were ya nye mmadu, si ya were cha lekota Kedukwanu onyinye anyi g’enye Chukwu, Osi n’okaria? Chineke Nna, aka m dikwa n’elu o Chineke Nna Okaka, Ibu Odogwu!
2. Chukwu di mma--, Chineke amaka
Chukwu dim ma--, Olu Aka Ya amakakwa Kedukwanu onyinye anyi g’enye Chukwu asi n’omakaria? Chineke Nna, aka m dikwa n’elu o Chineke Nna Okaka, Ibu Odogwu!
3. Kpakpando nile, nye Chukwu ekele
Onwa n’anyanwu nye Chukwu ekele Ka ihe nile ekereke too Gi, gozie Gi Chineke Nna aka m dikwa n’elu Cheneke Nna Okaka, Ibu Odogwu!
4. Ndi nna nile-- nyenu Chukwu ekele,
Ndi nne nile –nyenu Chukwu ekele Onye obula bilie bia nye Chukwu ekele Oburugodu na inweghi ego, lekene ndu gi Ndu ka aku, ndu bu isi, Chineke Nna, aka m dikwa n’elu, Chineke Nna, Okaka, Ibu Odogwu !!