Professional Documents
Culture Documents
PART ONE
N’emume nke oku, anyi nile ga-apu n’ezi ulo uka, a ga agbanyu oku nile
n’enwu enwu beluso nke etinyere n’iro ulo uka maka emume a. Nke a
n’egosi udiri chi jiri eji na ndu anyi; mana chi jiri eji ga-abo abo oso; ihe
bia, ochichiri agbaa oso. Ihe Kristi bata ochichiri di na-ndu anyi agbaa
oso. Ukochukwu buru Paschal candle duru anyi n’abata n’ulo uka, O
tie LUMEN KRISTI; anyi azaa DEO GRATIAS.
Anyi batazia n’ulo uka e kwee ukwe Pasca, wee banye n’emume nke
okwu.
Dika m siri kwuo, otutu okwu adighi n’uka mgbede. Aga m na-ano nso
ikowaputa ihe obula oge ya ruru. Anyi ga-puzi n’iro ulo uka ma mmalite
emume anyi.
PART TWO
EMUME NKE OKWU
(n’ime ulo uka(after the last lumen kristi)
Anyi ga-edere duu maka ukwe pascah (Exaultet) nke ihe omimi
juputara n’ime ya.
Ndi beanyi, o n’ abu Okwu di kwuru kwuru, edebe onu kwuru kwuru
wee kwuo ya. Ugbu a anyi ga- emenyuzi oku candle anyi notuo ala gee
ukochukwu nti.
Okwuchaa ihe oga agwa anyi, Oburuzia oge ihe ogugu. Ya bu n’anyi
nozi na agba nke abuo nke bu emume nke okwu.
Ka m maa okwa: Onye akujakwana akuja; maka na ihe ogugu anyi tata
agaghi adi ka o na-dibu.
Anyi nwere ihe ogugu ise nke ga-eme k’anyi ghota nke oma isi emume
anyi. Ato ga-esi na akwukwo agba ochie; otu esite n’akwukwo Ozi Paul
di aso; nke ikpeazu buzi ozioma.
Ndi beanyi, achoba isi ochu, a gaa n’uzu. Ihe ogugu a si na akwukwo
mbido ga akowaputara anyi otu uwa n’ihe niile di n’ime ya siri malite.
Igbo bu Igbo, o na abu okenye azu kaa nka O laa nnukwu osimiri. Ihe
ogugu a na-akowara anyi ka Abraham siri hu chukwu n’ anya nke
ukwuu ma na-atukwara ya ekwu. Nke mere n’ Oleghi anya n’azu ime
ihe Chukwu gwara ya, bu iji otu nwa ya chuo aja.
Onweghi ihe aka ngwere ga-eme ukwu oji. Ijiji na-agba tika tika n’elu
nsi bu egwu n’ihi na onweghi ihe oga eme ikpo nsi. Onweghi ihe eze
oke ga-eme ite ola. K’anyi gezia nti nuru otu Chukwu siri gosi ndi Egypt
nkari n’ihi ihunanya ya maka ndi Israel; Nakwuazi omume ndi Egypt
dika onye nzuzu egosichara ebe oga ada omechaa piarikoo ukwu n’ala
okwute.
AFTER COLLECT
Ojionu gbaa egwu bie egwu, a mara na ihe o na-agba n’egwu agwula.
Anyi esila n’agba ochie bata n’agba ohuu. Anyi ga-anuzi akwukwo ozi
Pol di aso degara ndi Rom. Ma anyi ga-eburu n’obi n’obughi ndi Rome
ka ana aguru ya ugbua; ya bu n’obu anyi ka Pol n’agwa.
Toonu nti n’ala nke oma.
EPISTLLE
Ndi beanyi, ahughi ebule, anaghi eli Dike. Oteela anyi tidebere alleluia;
ugbua, anyi ga akwuruzi oto ka alleluia leghachite azu n’onu anyi.
AFTER ALLELUIA
Ka anyi noro ala maka abu oma na aziza(Ps.117:1-2, 16-17,22-23).Ihe
anyi ga na aza bu Alleluia.
OZIOMA LK.24:1-12
YEAR C
Ndi beanyi,agwo turu mbe, turu okpokoro ya. Onweghi ihe oko jii na-
eme mma. Onwu na ekwensu enweghi ike obula n’ebe Kristi no, maka
na onye jide Ofo nna ya ujo adighi atu ya. Obu anu kara obi na-ebi
n’ohia achala.
Luke di aso ga-akowaputara anyi otu umunwanyi siri jiri obi abuo gaa
n’ili Jeso, mana ihe ha huziri turu ha n’anya mana otukpoghi ha anya.
Echetara ha ihe Jeso gwaburu ha na aga egbu nwa nke mmadu ma n’
O ga-esi n’onwu bilie n’ ubochi nke ato.
HOMILY
Chi mara onye o ga-enye , mana onye chi ga-enye amaghi. K’anyi gee
nti nuru ndumodu n’ihe Ukochukwu ga-akowaputara anyi, ma were
kwazie ya mere ihe, ka ndu ohuru anyi nwetara na Kristi ghara ila anyi
n’iyi
PART THREE
BAPTISM
Aka nri kwuo aka ekpe, aka ekpe akwuo aka nri. Chukwu emego nke
ya site n’okike okere anyi, nye anyi ndu n’ihe eji acho ya mma,
gbaghara anyi njo anyi, nye anyi ndu ohuru n’ime Kristi. Kunizienu bia
kele ya.
PART FOUR
EMUME NKE EUCHARISTIA DI ASO
Achuchaa aja ma ahughi udele mara n’ihe mere be ndi mmuo. Anyi
ga-abanyezi n’emume nke Eucharistia di aso bu oge kachasi nso.
Ndi oto Kristi ibe m, oriri adanuo! Amara na Ngozi nke Aja Missa a bu
maka mmadu niile, mana obu so ndi kwadoro onwe ha nke oma dika
Nkuzi na-Omenaala nke Nzuko siri di, ga abia inata oriri nso.
MMECHI
Ndi beanyi emume anyi ga-abiazi n’isi njedebe ugbua. Ugo nile mara
mma ma nke afuru ikpeazu n’adi ka okacha mma. Mmanu nile di uto ma
nke emere ohuru n’aka uto. Ukochukwu kpechaa ekpere gozie anyi,
anyi ewere onu naba n’ekwuputa otito Chukwu.