Professional Documents
Culture Documents
Ahiriokwu bu otu mkpuruokwu ma o bu mkprurokwu ole na ole gakoro onu n’ezigbo usoroma
nweekwa nghota zuru oke maka o nwere ngwea na ya.
Omumaatu :
Nne jere ahia
Obi bi n’aba
Chike bu ogo mi.
1. AHIRI MKPURUOKWU : Mkpuru okwu o bula nwere nghota zuru oke. Mkpuru okwu o
bula bu ahiriokwu n’onwe ya
Omumaatu : Puo, Bia, Gaa, Rie, Gini?, Ole?, Ndo.
2. AHIRI NHA : Nke a bu ahiriokwu abuo nokoro onu n’otu ahiriokwu nke o ga-abu e kewea
ha nke o bula n’ime ha nwekwa nghota nke ya, n’ihe na hia nwere ngwaa n’otu n’otu. O bu
ndiko ka e ji ejiko ha onu
Omumaatu :
1. Otu nne na-amu ma otu chi anaghi eke
2. Anyi gara aba mana anyi azuteghi ihe o bula.
3. AHIRI MFE : Ahiri mfe dika aha ya siri di bu ahiriokwu mwere naani otu ngwaa ma dikwa
mfe na nghota. O bu naani otu echiche ka o na-eziputa maka isiokwu o na-ekwu maka ya
Omumaatu :
1. O nwere ego
2. Obi riri nri
3. Ha gara akwukuo
4. AHIRI AJUJU : Nke a bu ahiriokwu na-aju ajuju. A na-etinye ya akara ajuju iji gosi na o
bu ahiri ajuju kpomkwem?
Omumaatu :
1. I tara azu ?
2. Obi o biara ebe a ?
3. O tiri uche ihe n’isi
5. AHIRI NKWE : Nke a bu ahiriokwu na ngwaa ya na-egosi ihe mere eme.
Omumaatu :
1. O riri nri
2. O maara akuzi ihe nke o ma
3. Ada gara ahia
6. AHIRI NJU : Nke a bu ahiriokwu na-egosi ojuju n’ihe ekwuru. O na-egosi ihe emeghi
emeghi eme o bu nsoriaazu “ghi” na-egosiputa ya
Omumaatu :
1. Nwosu anaghi acho okwu
2. Biko, achoghi m
3. Mba, agaghi.
7. AHIRI UKWU : Nke a bu udi ahiriokwu nke nwere karia ngwaa na echiche abuo mana
ahiriokwu ndi ozo na-adabere n’isiahir di n’ime ya.
1. Nne m gara ahia, zuta nri bulata tupu o gawa oru ugbo.
2. Ngozi gara akwukwo, imuta ka e si agu na ka e si ede, tupu o gawa ilu di.
8. AHIRI NTIMIWU : Udi ahiriokwu a na-agwa mmadu ka o mee ihe ma o choro ihe ahu ma
o bu na o choghi, Isingwaa di na ya na-enwe nsoneazu.
Omumaatu:
1. Gaa rie nri
2. Puo ebe a ka m rie nri
3. Bia ebe a chika
4. Mechie onu.