You are on page 1of 2

AHIRIOKWU (SENTENCES)

Ahiriokwu bu otu mkpuruokwu ma o bu mkprurokwu ole na ole gakoro onu n’ezigbo usoroma
nweekwa nghota zuru oke maka o nwere ngwea na ya.
Omumaatu :
Nne jere ahia
Obi bi n’aba
Chike bu ogo mi.

NJIRIMARA AHIRIOKWU (characteristics of a sentence)


1. O ga-enweriri mkpuruokwu
2. O ga-enweriri ezigbo usoro dika isiahiri → ngwaa → mmedu.
3. O ga-enwe ngwea. Ngwua di mkpa n’ahiriokwu nke ukwuu
4. Ahiriokwu ga-enwe nghota zuru oke.

UDI AHIRIOKWU (types of sentences)


1. Ahiriokwu mkpuruokwu (one word sentence)
2. Ahiri mfe (simple sentence)
3. Ahiri nha (compound sentence)
4. Ahiri ajuju (Interrogative sentence)
5. Ahiri ukwu (complex sentence)
6. Ahiri ntimiuju (command)
7. Ahiri nju (Negative)
8. Ahiri nkwe (Positive)

1. AHIRI MKPURUOKWU : Mkpuru okwu o bula nwere nghota zuru oke. Mkpuru okwu o
bula bu ahiriokwu n’onwe ya
Omumaatu : Puo, Bia, Gaa, Rie, Gini?, Ole?, Ndo.
2. AHIRI NHA : Nke a bu ahiriokwu abuo nokoro onu n’otu ahiriokwu nke o ga-abu e kewea
ha nke o bula n’ime ha nwekwa nghota nke ya, n’ihe na hia nwere ngwaa n’otu n’otu. O bu
ndiko ka e ji ejiko ha onu
Omumaatu :
1. Otu nne na-amu ma otu chi anaghi eke
2. Anyi gara aba mana anyi azuteghi ihe o bula.
3. AHIRI MFE : Ahiri mfe dika aha ya siri di bu ahiriokwu mwere naani otu ngwaa ma dikwa
mfe na nghota. O bu naani otu echiche ka o na-eziputa maka isiokwu o na-ekwu maka ya
Omumaatu :
1. O nwere ego
2. Obi riri nri
3. Ha gara akwukuo
4. AHIRI AJUJU : Nke a bu ahiriokwu na-aju ajuju. A na-etinye ya akara ajuju iji gosi na o
bu ahiri ajuju kpomkwem?
Omumaatu :
1. I tara azu ?
2. Obi o biara ebe a ?
3. O tiri uche ihe n’isi
5. AHIRI NKWE : Nke a bu ahiriokwu na ngwaa ya na-egosi ihe mere eme.
Omumaatu :
1. O riri nri
2. O maara akuzi ihe nke o ma
3. Ada gara ahia
6. AHIRI NJU : Nke a bu ahiriokwu na-egosi ojuju n’ihe ekwuru. O na-egosi ihe emeghi
emeghi eme o bu nsoriaazu “ghi” na-egosiputa ya
Omumaatu :
1. Nwosu anaghi acho okwu
2. Biko, achoghi m
3. Mba, agaghi.
7. AHIRI UKWU : Nke a bu udi ahiriokwu nke nwere karia ngwaa na echiche abuo mana
ahiriokwu ndi ozo na-adabere n’isiahir di n’ime ya.
1. Nne m gara ahia, zuta nri bulata tupu o gawa oru ugbo.
2. Ngozi gara akwukwo, imuta ka e si agu na ka e si ede, tupu o gawa ilu di.
8. AHIRI NTIMIWU : Udi ahiriokwu a na-agwa mmadu ka o mee ihe ma o choro ihe ahu ma
o bu na o choghi, Isingwaa di na ya na-enwe nsoneazu.
Omumaatu:
1. Gaa rie nri
2. Puo ebe a ka m rie nri
3. Bia ebe a chika
4. Mechie onu.

You might also like