You are on page 1of 5

OKWU MMALITE

Ezinaụlọ zuru ụwa nile ọnụ makana ọ bụ na ya ka mmadụ nile si pụta. Onye ọ
bụna bụ mmadụ nwere ezinaụlọ o si pụta. Ezinaụlọ nile bụ otu mana nghọta ndị
ọcha dị iche na nghọta ndị Igbo n’ihe gbasara ezinaụlọ

ụwa dị mma bụ na ezinaụlọ dị mma, na ụwa dị njọ bụ na ezinaụlọ dị njọ.

GINI BU EZINAULO?

Nghọta ndị Igbo gbasara ezinaụlọ dị iche na nke ndị ọcha. Ndị ọcha ghọtara
ezinaụlọ dịka nna, nne na ụmụ ha, ma n’ebe ndị Igbo nọ, ezinaụlọ bụ nke
metụtara ka ha ra biri n’otu ngwuru ma ọ bụ karịa. O metụtara nne, nna, ụmụ,
ụmụnne, ikwunibe, ndị ọgọ w.d.g.

Ezinaulo bukwa otu mmadu ndi ejikoro site na obara .

UDI EZINAULO ENWERE

Enwere udi Ezinaulo ato nke ha bu:

Ezinaulo otu mkpuke,

Ezinaulo ubara

Ezinaulo mgbasa.

Ezinaụlọ otu mkpuke pụtara ezinaụlọ e nwere nanị otu usoekwu. N’ebea ka e
nwere nanị nne, nna, ụmụ na mmadụ ole na ole binyeere ha dịka odibo ma ọ bụ
ohu. Ọ na-ahia ahụ I nweta ụdi ezinaụlọ a n’etiti ndị Igbo.N’etiti ndị ocha ka a na-
enweta ụdị ezinaụlọ a.

Ezinaulo ubara mkpuke bu ezinaulo nwoke nwe ulo na alu karia otu nwanyi ya bụ
ebe nwoke na-alụ igwe nwanyị. Ihe e ji amata nke a bụ ụbara usoekwu,
tinyerekwa ekworo ma ọ bụ ndọrọndọrọ nwunye di.
Ezinaulo mgbasa bu nke gunyere di, ndi nwuye,na umuaka, nne di, nna di, ikwu na
ibe ma tinyekwara ndi ogo, obu udi ezinaulo a ka ndi igbo na enwe ngalaba obu
ewumewu nwoke nwere nnukwu onodu na ndu ndi igbo.

Ụdị ezinaụlọ a bara nnukwu uru.Ọ na-enye aka izulite ụmụaka n’omenala a
mụnyere ha n’ime ya. Ọ na-eme ka ahụhụ belatara ndị okenye n’ihi na ọ na-abụ a
zụchaa ụmụaka, ha amalite ilekọta ndị zụrụ ha. Ọ na-eme ka obi sie ndị nọ n’ime
ya ike n’ihi na igwe bụ ike. N’agbanyeghị uru ndị a, ezinaụlọ mbasa nwekwara
ọghọm nke gụnyere na onye aka siri ike na ya na ata ahụhụ n’ihi na ndị ọzọ na-
echekwube na ya.

Ezinaulo bu isi ahuru kwaba okpu na ndu ndi mmadu maka na onye obula bu
mmadu si nime Ezinaulo puta. Mmekorita mmadu na ibe ya na ebido na ezinaulo.
Nwa ọ bụla a mụnyere n’ezinaụlọ ọ bụla na-esite na ya mụta ihe gbasara
mmekọrịta mmadụ na ibe ya tupu ọ pụta n’obodo.

ORU NNE,NNA NA UMUAKA

Ma NNE ,NNA n UMUAKA nwere Oru diri ha na ezinaulo nke onye obula na ime ha
ga aruriri nke ya ihe ewee na aga na usoro ya

ORU NNA NA EZINAULO

Igba mbo hu na enwere ihunaya na udo na ezinaulo

ILu Ulo Ezinaulo ga ebi

Iweta ego nri

Izu umuaka

Ikuziri umuaka omenala obodo ha

Ichekwa ezinaulo
ORU NNE NA EZINAULO

Inye umuaka Ezi ozuzu

Inye umuaka Ezi ndumuodu

Isi nri ezinaulo ga eri

ilekota umuaka

ORU UMUAKA NA EZINAULO

Ije ozi

Iko oru ubi

Inyere nne aka isi nri

Iza ulo

Ikpa nku

Isa akwa

Ichu mmiri

MAKA EZINAULO M

Aha m bu Amaele Unique Chimaobi

Esi m na Ezinaulo mazi Emmanuel Amaele ya na odozi aku bu Better Amaele Nwa
Joseph ihesikoma nke Amaekpu di na isiala ngwa nke Abia steeti na ndi nwuye
ndi ozo. ha bu odoziaku Joy Amaele na odoziaku Monica Amaele.
Anyi bu ndi umudike umuogba nke di na omuma lokal govamenti na ime Rivas
steeti.. Ezinaulo m bu ezinaulo ama ama na obodo anyi nihi na family bu otu na
ime ezinaulo eji ama atu .

Anyi bi na uzo odo ugbo elu (Airport Road) di na potakot ebe nna m luru ulo anyi
bi ugbua ... Anyi di ise biri ebe ahu ugbua nihi na ndi ozo alua la ulo nke ha, ihe ha
na eme ibia hu Nna m na umunne m nd I no ulo

Anyi bu Ezinaulo ubara mkpuke nke nwoke nwe ulo na alu karia otu nwanyi...Nna
luru umunwanyi ato nke Nne m bu onye nke abuo na ime ha.

Nna m luru m NNE m na afo 1992 na onwa abuo bu febuwari

Nna m muru anyi iri abuo na otu, umunwanyi asato na umunwoke iri na ato nke
umu ya ato no mba ofesi ,Abu m onye nke iri na ato na umu Nna m ma na afo
NNE m anyi di umu ise, nwoke ato na umunwanyi abuo nke m bu onye NNE abuo
na ime ha.

Nna m bu onye olu odibo govamenti nke ndi oyibo na akpo "civil servant" na
steeti Rivas...Nne m azu ahia na Potakot dikwa na Rivas steeti.

Ezinaulo m bu ndi uka oloro ohuu nke ndi oyibo na akpo (Pentecostal church) nani
m bu onye na eje uka katolic na ezinaulo m.

Ha di umu nna m iri na isii ndi nna m zuru na mahadum ji akwukwo asambodo nke
mahadum. Umunna m ndi nwanyi aluchala di ma ndi nwoke aluchabeghi nwanyi.

Ezinaulo bu Ezinaulo na atu egwu chineke na agbanyeghi na ha abughi ndi uka


katolic...Obu ezinaulo eji ihe oma mara.

Obu Ezinaulo nwere udo na ihunaya nihi na Nna m gbara mbo ihu na ihe nile na
ga nke oma nke bu na igaghi ama na obughi otu nne ji muna umunna m ma
ugbua ihe nile biara mebie kemgbe Nna m na NNE m nwuchara..Nwanne amaghi
nwannne, nwanna amaghi nwanna...echetara m mgbe nna m di ndu ihe erimeri
anaghi ako na ezinaulo anyi ma na ugbua aguu di na ezinaulo m. Ezinaulo m bu
ezinaulo eji udo na ihunaya mara mama ugbua udo na ihunaya adizikwaghi nke
mere elibeghi nna m nwuru kamgbe afo gara aga.
MMECHI

Ezinaulo so na otu ihe chukwu okike abiama hiwere na mgbe okechara mmadu
Chineke kwuru na Genesis isi nke abụọ na ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ sọ ya wee
mee ka Adam na Eve bikota onu ka Ezinaulo wee si ha gaa na uwa ga muba, ya
mere obu oru NNE na Nna igba mbo hu na ezinaulo obula nwere ezi ihunanya na
udo na ezi ozuzu....

You might also like