You are on page 1of 3

Abu oma 90:2, “Tupu i kee ukwu niile ma o bu mee ka uwa di, gi onwe gi bu Chi nke na adigide, i ga-abukwa

Chineke rue
ebighi-ebi”.
Gwa Archippus, si ya, Lezie anya na ojije ozi ahu bu nke i natara n’ime Onye nweanyi, hu na i ga emezu ya (Ndi Kolosi
4:17).
Gini? O bu na unu amataghi na aru unu bu ulo nso nke Mmuo Nso…? (1 Ndi Korint 6:19).
“…n’ihi na unu onwe unu bu ulo nso nke Chineke di ndu; dika Chineke siri, m ga ebi n’ime ha, ma jegharia n’ime
ha; mu onwe m ga aburu ha Chineke, ha onwe ha ga abukwara m ndi.”

1 Ndi Korint 2:12, ugbua, anyi anatawo, o bughi mmuo nke uwa, kama, mmuo ahu nke sitere na Chineke; ka anyi wee
mara ihe niile nke Chineke nyere anyi n’efu.”
“ha amaghi, ha agaghi, aghotakwa, ha na ejeghari na ochichiri: ntoala niile nke uwa togboro nkiti. Mu onwe m
asiwo, unu onwe unu bu chi; unu niile bu umu nke onye kachasi ihe niile elu. Ma unu onwe unu ga anwu dika
mmadu, ma daa dika otu n’ime ndi isi nke uwa” (Abu Oma 82:5-7)

“ekele diri Chineke na Nna nke onye nweanyi Jisus Kraist, onye jiworo ihe niile nke Mmuo Nso wee gozie anyi n’ebe
niile nke eluigwe n’ime Kraist”(Ndi Efesos 1:3).

ihe iriba-ama ndia ga-esokwa ndi kwere; n’aha m ka ha ga achupu mmuo ojoo, ha ga ejikwa ire ohu di iche iche kwuo
okwu (Mak 16:17).
“Mu onwe m ga ekpekwara Nnam, O ga ezitekwara unu onye nkasi obi ozo, ka o nonyere unu ebighi-ebi; bu Mmuo nke
eziokwu; onye uwa na apughi inara, n’ihi na ha adighi ahu ya, ha adigh amatakwa ya: mana unu onwe unu matara ya; n’ihi na o
na ebinyere unu, o na-ebikwa n’ime unu” (Jon 14:16-17).

Matiu 28:18, Ma Jisus biakutere ha wee gwa ha okwu si,ewerewo ike niile di n’elu igwe na nke di n’elu uwa nye m n’aka.
Ya mere gaanu,kuziere mba niile, n’eme ha baptism baa n’aha nke nna, na nke Okpara, na nke Mmuo Nso.”
“Ma bilie, guzokwa n’ukwu gi: n’ihi na e mere m ka i hu m anya n’ihi ihe a, ime gi ka i buru onye n’eje ozi na onye ama...”
(Olu Ndi Ozi 26:16-18).
Ugbua, ekele diri Chineke, onye na-eduru anyi gaa n’ọn̄ụ nke nmeri mgbe niile n’ime Kraist, na esitekwa n’aka anyi egosi
isisi nke omuma ya n’ebe niile (2 Ndi Korint 2:14).
Ndi Rom 11:13, “A bu m onye ozi nye ndi mba ozo; a na m ewuli ije ozi m.”

gabiga na Jordan, gi na ndia , ga n’ala ahu bu nke m na enye ha...n’ihi na o bu n’iru ndia ka i ga ekewa ala ahu nye
ha dika ihe nketa, bu nke m n̄uru iyi nye nna ha inye ha.”(joshua 1)

Ndi Rom 8:11: “Ma o buru na mmuo nke onye ahu nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie ebiri n’ime unu,
onye ahu nke kpolitere Jisus n’onwu puru itute anu ahu unu site na mmuo ya ahu nke na-ebi n’ime unu.”

Ndi Efesos 2:10 “N’ihi na anyi bu oru aka Chineke (ihe o mere),nke ekeghariri n’ime Kraist Jisus, [a muru ohuu] ka anyi
wee luo ezi olu niile ahu nke Chineke buru uzo ka-aka (nke o buru uzo kwado) nye anyi [ka anyi jegharia n’uzo nke o kwadoro tupu
oge eruo], ka anyi wee jegharia n’ime ha [na ebi ndu oma ahu nke okwadorori na nke o mere nye anyi ka anyi na-ebi].”
Ndi Rom 8:29-30, “N’ihi na ndi o buru uzo mara, ha ka o buru uzo kakwa-akaa, ka ha nweko otu udi na onyinyo nke
okpara ya, ka o wee buru onye e buru-uzo mu n’etiti otutu umunna. Ma ndi o buru-uzo kaa-akaa, ndi ahu ka o
kpokwara: Ma ndi o kporo, ndi ahu ka o gukwara na ndi ezi omume: Ndi o guru na ndi eziomume, ha ka o
nyekwara otuto.”
“…mgbe o di ka o bu naani ihe isi-ike ka i na eche iru, huta ya dika ohere puru iche iji nwaputa oke ọn̄ụ nke i nwere! N’ihi
na i matara na mgbe a na-anwale okwukwe gi, o na akpali n’ime gi ike nke nnagide. Ma mgbe nnagide ahu na-eto n’ike, O na
enyeghachi izuoke nye ahu gi niile rue mgbe o na-adighi ihe n’efu-efu ma o bu nke a na-acho acho” (James 1:2-4).
James 1:4, “...ezi ndidi nke nnagide wetara ga-agbaju gi ka i garue ogologo njem ma gafee oke nke ihe ngaru—ntozu
oke.”
“ma ka nnagide na nkwusike na ndidi nwee ezi ngosi, ka o luokwa olu zuru oke, ka unu wee buru[ndi] tozuru etozu
[na-enweghi nkwaru], na adighi ihe ana acho-acho.” James 1:2-4

Jisus siri ya, mu na gi anowo otutu oge di otua, ma i mataghi onye m bu Philip? Onye huru m anya ahuwo Nna m; Ma gini
mere i ji wee si, Gosi anyi Nna ahu? (Jon 14:9).
“Ma mgbe onye isi nke ndi ozuzu aturu ga-abia, i ga-anata okpu eze nke ebube nke na-adighi ata nchara” (1Pita 5:4).
Ma dika e dere ya n’akwukwo, anya ahubeghi, nti akaghi nu, O baghikwa n’obi mmadu, ihe Chineke kwadoro nye ndi
huru ya n’anya (1 Ndi Korint2:9).
“ugbua anyi anatawo, o bughi mmuo nke uwa, kama Mmuo nke sitere n’ebe Chineke no bia; ka anyi wee mara ihe ndi
ahu bu nke Chineke nyere anyi n’efu” (1Ndi Korint 2:12)
Olu Ndi Ozi 20:32, “ Ma ugbua, umu nna m, a na m aranye unu n’aka Chineke, na n’okwu nke amara ya, nke nwere
ike iwuli unu, nyekwa unu ihe nketa n’etiti ndi a sachara.”

“ka okwu Chineke ba uba n’amam ihe niile n’ime unu; na akuzi, na-adukoritakwanu onwe unu odu n’abu oma,
n’ibu abu na egwu n’ime mmuo unu, na-eji amara buo abu n’obi unu nye Chineke” (Ndi Kolosi 3:16).

O dighi egwu di n’ihunanya; kama ihunanya zuru oke na achupu egwu: n’ihi na egwu na akpagbu. Onye o bula na atu
egwu, emeghi ya ka o zuo oke n’ihunanya(1 Jon 4:18).
“N’ihi na Chineke enyeghi anyi mmuo nke ujo; kama nke ike, na nke ihunanya, na nke obi ike” (2 Timoti 1:7).

1 Jon 4:4, “Umu ntakiri m, unu bu nke Chineke, unu emeriwokwa ha: n’ihi na onye no n’ime unu di ukuu karia onye no
n’uwa.”
N’ihi na ihe o bula o muworo site na Chineke bu onye nmeri n’ebe uwa di; ma nkea bu nmeri nke meriri uwa, o bu na
okwukwe anyi (1 Jon 5:4).
“ Ka ewepu obi ilu niile, na onuma, na iwe, na iti nkpu, na nkwulu n’etiti unu, ha na ire-otu” (Ndi Efesos 4:31).
1Ndi Korint 14:20, “N’ibu iwe n’obi, burunu umuntakiri, mana, na nghota burunu ndi tozuru oke.

Ndi Kolosi 3:8, “Ma ugbua yipunu ihe ndia; iwe, onuma, ibu iro, nkwuto, nkparita uka rere-ure nke n’esi n’onu unu
aputa.”

Ya mere, o buru na onye o bula a noo n’ime Kraist, O bu ihe e kere ohuu: ihe ochie agasiwo; Lee, ihe niile aghowo ihe
ohuu (Ndi Korint 5:17).
O buru na okpara ahu ga eme ka i nwere onwe gi, i ga-abu onye nwere onwe ya n’ezie”(Jon 8:36).

Ndi Rom 4:25 nke AMPC na e mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie n’ihi “...nnaputa, [na-eme ka ihe nguko anyi
zuo oke na anaputakwa anyi puo na amam-ikpe n’iru Chineke].”

iwu a ka m na enye n’aka gi idebe, nwa m Timothy, Dika amuma niile nke e buru uzo bu n’isi gi si di, na i ga-esite na ha
buo agha oma nkea (1 Timoti 1:18).
“N’ihi na o bu ezie na anyi na-ejeghari n’anu aru, ma anyi adighi ebu agha dika anu aru si ebu”. “(n’ihi na ngwa-
agha nke agha anyi esiteghi na-anu aru, kama, ha sitere na Chineke di ike bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike;).” (2
Ndi Korint 10:3-4).

Ndi Kolosi 3:16 siri, “ka okwu nke Kraist biri n’ime gi n’ebe o bara uba....”

“...Mu onwe m biara ka ha wee nwe ndu, ma nwebigakwa ya oke” (John 10:10).
1 Jon 3:8 “O bu n’ihi ihea ka e mere ka okpara Chineke puta ihe, ka o wee laa oru niile nke ekwensu n’iyi.”
Luk 19:10, “Nwa nke mmadu biara ichota ihe furu efu na idebe ha.
“Nri m sitere n’ime uche onye ahu nke zitere m, na iluzu olu ya” (Jon 4:34).

“onye na-emepe anya ndi mba ozo, sikwa n’ochichiri mee ka ha baa n’ihe, ya na inaputa ha n’ike nke ekwensu wee
kpotara ha Chineke, ka ha wee nara ngbaghara nmehie, na ihe nketa n’etiti ndi asachara site n’okwukwe nke di n’ime Jisus Kraist”
(Olu Ndi Ozi 26:17-18).
Ndi Korint 9:26, “mu omwe m na agba oso otua, o bughi dika onye na-agba n’eleghi anya ihe; otua ka m n’alu ogu,
o bughi dika onye n’eti ifufe ihe.”

Ma i ga amara eziokwu ahu, eziokwu ahu ga-emekwa ka i nwere onwe gi (Jon 8:32).
“Ndi m na ala n’iyi n’ihi na ha enweghi omuma” (Hosea 4:6).

“ihe iribe-ama ndia ga eso ndi kwere...o buru na ha erie ihe o bula na-egbu egbu, o pughi imeru ha aru...” (Mak 16:
17-18).

You might also like